Jenesis 42:35
Genesis 42:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu.
Genesis 42:35 in English
Genesis 42:35 · Berean Standard Bible
As they began emptying their sacks, there in each man’s sack was his bag of silver! And when they and their father saw the bags of silver, they were dismayed.
Context
33“Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu. 34Ma kpọtara m nwanne unu nke nta. Mgbe ahụ ka m ga-ama ihe unu bụ. Ma unu bụ ndị nnyopụta maọbụ ndị ezi mmadụ. Mgbe ahụ, aga m ahapụrụ unu nwanne unu. Unu ga na-azụkwa ahịa nʼala a.’ ” 35Mgbe ha bidoro ịwụpụtasị ọka dị nʼakpa ha, lee, nʼime akpa ọka onye ọbụla, a chọtara ego ọ kwụrụ nʼakpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ ego ndị a, ha tụrụ egwu. 36Ya mere, nna ha Jekọb gwara ha sị, “Unu agbawala m aka ụmụ. Josef anọghị, Simiọn anọkwaghị. Ma unu na-achọ iwezuga Benjamin. Naanị m ka ihe niile ndị a na-emegide!” 37Mgbe ahụ, Ruben gwara nna ya sị, “I nwere ike gbuo ụmụ m ndị ikom abụọ ma ọ bụrụ na m akpọghachighị Benjamin. Tifee ya nʼaka m, aga m akpọghachikwara gị ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.