Jenesis 42:32
Genesis 42:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’
Genesis 42:32 in English
Genesis 42:32 · Berean Standard Bible
We are twelve brothers, sons of one father. One is no more, and the youngest is now with our father in the land of Canaan.’
Context
30“Nwoke na-achị ala ahụ gwara anyị okwu nʼolu ike. O mesoro anyị mmeso dịka anyị bụ ndị bịara inyochapụta obodo ha. 31Ma anyị gwara ya sị, ‘Anyị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi, ndị na-abụghị ndị nnyopụta obodo. 32Anyị dị ụmụnne iri na abụọ ndị nwere otu nna. Otu nʼime anyị anọkwaghị, ma nke ntakịrị na nna anyị nọ na nʼala Kenan taa.’ 33“Mgbe ahụ, nwoke a, onye na-achị ala ahụ, sịrị anyị, ‘Nke a ka m ga-eji mata ma unu bụ ndị ezi mmadụ. Hapụrụnụ m otu nwanne unu. Burunu ọka, bulaara ndị ezinaụlọ unu agụụ na-agụgbu. 34Ma kpọtara m nwanne unu nke nta. Mgbe ahụ ka m ga-ama ihe unu bụ. Ma unu bụ ndị nnyopụta maọbụ ndị ezi mmadụ. Mgbe ahụ, aga m ahapụrụ unu nwanne unu. Unu ga na-azụkwa ahịa nʼala a.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.