Jenesis 42:13
Genesis 42:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ. Ọ bụkwa otu nna mụrụ anyị niile. Nna anyị na nwanne anyị nta, onye ikpeazụ ọ mụrụ nọ na Kenan ugbu a. Ma otu onye nʼime anyị anwụọla.”
Genesis 42:13 in English
Genesis 42:13 · Berean Standard Bible
But they answered, “Your servants are twelve brothers, the sons of one man in the land of Canaan. The youngest is now with our father, and one is no more.”
Context
11Anyị niile bụ ụmụ otu nna. Ndị ohu gị bụ ndị kwesiri ntụkwasị obi. Anyị abụghị ndị nnyopụta.” 12Ma Josef gwara ha sị, “Mba! Unu bịara ịchọpụta akụkụ obodo anyị nke a na-echezighị nke ọma.” 13Ha zara sị ya, “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ. Ọ bụkwa otu nna mụrụ anyị niile. Nna anyị na nwanne anyị nta, onye ikpeazụ ọ mụrụ nọ na Kenan ugbu a. Ma otu onye nʼime anyị anwụọla.” 14Josef sịrị, “Ihe unu na-akọ na-egosi na unu bụ ndị nnyopụta, dịka m gwara unu. 15Nke a ka a ga-eji anwale unu. Nʼaha Fero dị ndụ, unu agaghị esi nʼebe a laa tutu nwanne unu nke nta ahụ abịa nʼebe a.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.