Native Bible

Genesis 41:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ.

Genesis 41:6 in English

Genesis 41:6 · Berean Standard Bible

After them, seven other heads of grain sprouted, thin and scorched by the east wind.

Context

4Mgbe ahụ, ehi ndị a bụ naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ bịara richapụ ehi ndị ahụ buru ibu. Mgbe nke a mere Fero kwolitere. 5Emesịa, Fero rahụkwara ụra ọzọ, rọọ nrọ nke ugboro abụọ, hụ ogbe ọka asaa ndị mịrị nʼotu ukwu ọka. Ogbe ọka ndị a buru ibu maa ezi mma. 6Emesịa, ọ hụkwara ogbe ọka asaa ọzọ ka ha mịkwara nʼotu ukwu ọka ahụ. Ma ndị a ọ hụrụ kpọnwụsịrị akpọnwụ, fịkpọkwa afịkpọ. Ọ bụ ikuku si nʼọwụwa anyanwụ mere ka ha kpọnwụọ. 7Ogbe ọka ndị a fịkpọrọ afịkpọ loro ogbe ọka asaa ndị ahụ buru ibu. Fero kwolitere hụ na ihe ndị a bụ nrọ. 8Mgbe chi bọrọ, o nweghị udo na mmụọ ya. O ziri ozi kpọkọta ndị majiki niile, na ndị ọkachamara niile nke Ijipt. Fero kọọrọ ha ihe ọ rọrọ na nrọ. Ma ọ dịghị onye nwere ike ịkọwara ya ihe nrọ ya pụtara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.