Native Bible

Genesis 41:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe mere Fero ji rọọ nrọ a ugboro abụọ bụ nʼihi na Chineke ekpebiela na ihe ndị a ga-emezuriri. Chineke ga-emekwa ya nʼoge na-adịghị anya.

Genesis 41:32 in English

Genesis 41:32 · Berean Standard Bible

Moreover, because the dream was given to Pharaoh in two versions, the matter has been decreed by God, and He will carry it out shortly.

Context

30Emesịa afọ asaa oke ụnwụ ga-eso ha. Mgbe ahụ, a ga-echefu ụba niile nke ala Ijipt. Ụnwụ a ga-ala obodo nʼiyi. 31Agaghị echetakwa na e nwere oge ịba ụba ihe oriri nʼala a, nʼihi oke ụnwụ ahụ nke ga-eso ya ga-adị oke ukwuu. 32Ihe mere Fero ji rọọ nrọ a ugboro abụọ bụ nʼihi na Chineke ekpebiela na ihe ndị a ga-emezuriri. Chineke ga-emekwa ya nʼoge na-adịghị anya. 33“Ma ugbu a, ka Fero chọọ onye nwere ezi nghọta na amamihe. Ya mee ya onyeisi ọchịchị nʼala Ijipt niile. 34Ka Fero mee nhọpụta ndị nlekọta ala Ijipt. Ka e debe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke nri niile a ga-enweta nʼoge ahụ nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.