Native Bible

Genesis 4:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd,* obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden.

Genesis 4:16 in English

Genesis 4:16 · Berean Standard Bible

So Cain went out from the presence of the LORD and settled in the land of Nod,* east of Eden.

Context

14Ugbu a, abụ m onye i si nʼala ubi ya chụpụ. Abụkwa m onye i si nʼihu gị chụpụ. Bido taa aga m abụ onye na-awagharị awagharị nʼime ụwa. Onye ọbụla hụkwara m ga-egbu m.” 15Onyenwe anyị zara sị ya, “O nweghị onye ga-egbu gị, nʼihi na aga m atụkwasịrị onye ọbụla metụrụ gị aka ntaramahụhụ okpukpu asaa karịa nke m nyere gị.” Ya mere, Onyenwe anyị kara Ken akara iji gbochie onye ọbụla hụrụ ya igbu ya. 16Ken sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ gaa biri nʼala Nọd,* obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Iden. 17Ken na nwunye ya dinakọrọ, nwunye ya tụụrụ ime mụta nwa nwoke aha ya bụ Enọk. Nʼoge a, Ken nọ na-ewu otu obodo ọ gụrụ Enọk, nke bụ aha nwa ya nwoke. 18Enọk bụ nna Irad, Irad bụ nna Mehujael, Mehujael bụ nna Metusael, Metusael abụrụ nna Lamek.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.