Jenesis 39:8
Genesis 39:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya.
Genesis 39:8 in English
Genesis 39:8 · Berean Standard Bible
But he refused. “Look,” he said to his master’s wife, “with me here, my master does not concern himself with anything in his house, and he has entrusted everything he owns to my care.
Context
6Ya mere, ọ hapụrụ ihe niile o nwere nʼaka Josef. Nke a mere na ọ mazighị ihe ọzọ na-eme, ma ọ bụghị nri nke ọ na-eri.*
Josef nʼonwe ya mara mma ahụ dịkwa mma ile anya. 7Mgbe oge nta gasịrị, nwunye Pọtifa lere Josef anya sị ya, “Bịa ka anyị abụọ dinaa.” 8Ma Josef jụrụ. Ọ gwara nwunye nna ya ukwu sị, “Lee, nna m ukwu anaghị echegbu onwe ya banyere ihe ọbụla nʼụlọ a. O werela ihe niile o nwere nyefee m nʼaka ka m lekọta ha anya. 9O nweghị onye ọnọdụ ya dị elu karịa nke m nʼụlọ a. O gbochighị m ihe ọbụla ma ọ bụghị gị, nʼihi na ị bụ nwunye ya. Olee otu m ga-esi mee oke ihe ọjọọ dị otu a, mee mmehie megide Chineke.” 10Ọ bụ ezie na nwanyị a nọgidere na-enye Josef nsogbu site nʼụbọchị ruo ụbọchị ma Josef jụrụ iso ya dinaa, jụkwa ịnọnyere ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.