Native Bible

Genesis 38:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.”

Genesis 38:24 in English

Genesis 38:24 · Berean Standard Bible

About three months later, Judah was told, “Your daughter-in-law Tamar has prostituted herself, and now she is pregnant.” “Bring her out!” Judah replied. “Let her be burned to death!”

Context

22Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna* ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ” 23Juda zara, “Ka o jide ihe niile o ji, ma ọ bụghị otu a anyị ga-aghọ ihe ọchị. Lee, ezigarala m ya nwa ewu a, ma gị onwe gị achọtaghị ya.” 24Mgbe ọnwa atọ gasịrị, ozi ruru Juda ntị sị, “Tama nwunye nwa gị gbara akwụna, bịa site nʼịgba akwụna dịrị ime.” Juda sịrị, “Kpọpụtanụ ya ka akpọọ ya ọkụ.” 25Ma mgbe ha kpọ ya na-apụta, o zigara nna di ya ozi, sị, “Ọ bụ nwoke nwee ihe ndị a tụwara m ime. Ọ sịkwara, Leruo anya ma ị ga-amata onye nwe ihe ndị a: mgbaaka akara a na eriri ya, na mkpanaka a.” 26Juda ghọtara ha, sị, “Ọ bụ onye ezi omume karịa m, ebe ọ bụ na m jụrụ ịkpọrọ ya kpọnye nwa m nwoke Shela ka ọ bụrụ nwunye ya.” O dinakwaghị ya ọzọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.