Native Bible

Genesis 38:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya.

Genesis 38:20 in English

Genesis 38:20 · Berean Standard Bible

Now when Judah sent his friend Hirah the Adullamite with the young goat to collect the items he had left with the woman, he could not find her.

Context

18Ọ sịrị, “Kedụ ihe akaebe m ga-enye gị?” Ọ zara, “Mgbaaka akara gị na eriri ya, na mkpanaka dị gị nʼaka.” O nyere ya ihe ndị a. Ọ bakwuru ya nke mere na ọ tụụrụ ime. 19Mgbe o si nʼebe ahụ pụọ, o yipụrụ akwa ahụ o ji kpuchie ihu ya, yirikwa uwe mkpe ya. 20Mgbe Juda zigara enyi ya onye Adulam ka ọ gaa wegara ya nwa ewu ahụ, ma nataghachi ihe ibe ahụ, ọ hụghị ya. 21Ọ jụrụ ndị ikom bi nʼebe ahụ sị, “Olee nwanyị akwụna ụlọ arụsị ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama Enayim?” Ha sịrị, “O nweghị nwanyị akwụna ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.” 22Ya mere, ọ laghachiri gaa gwa Juda, “Ahụghị m ya. Ọzọkwa, ndị ikom ndị bi nʼebe ahụ sịrị, ‘O nweghị nwanyị akwụna* ụlọ arụsị nọrọla nʼebe a.’ ”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.