Jenesis 38:12
Genesis 38:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị.
Genesis 38:12 in English
Genesis 38:12 · Berean Standard Bible
After a long time Judah’s wife, the daughter of Shua, died. When Judah had finished mourning, he and his friend Hirah the Adullamite went up to his sheepshearers at Timnah.
Context
10Ma ihe a o mere jọrọ njọ nʼanya Onyenwe anyị. Nʼihi ya Onyenwe anyị gbukwara ya. 11Juda sịrị nwunye nwa ya, bụ Tama, “Laa nʼụlọ nna gị nọrọ dịka nwanyị di ya nwụrụ tutu Shela nwa m nwoke etoo.” Ma echiche ya bụ, “ka ọ ghara ịnwụ dịka ụmụnne ya.” Tama lara gaa biri nʼụlọ nna ya. 12Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nwunye Juda nwa Shua nwụrụ. Mgbe oge nkasiobi ya gasịrị, Juda jere Timna, ya na enyi ya Hira, onye Adulam, ilekọta ndị na-akpụchapụ igwe ewu na atụrụ ya ajị. 13A gwara Tama sị ya, “Nna di gị na-aga Timna ịkpacha atụrụ ya ajị.” 14O yipụrụ uwe mkpe ya, were akwa mkpuchi kpuchie onwe ya gaa nọdụ ala nʼọnụ ụzọ ama Enayim, nke dị nʼụzọ e si aga Timna. O mere otu a nʼihi na ọ matara na Shela etoola, ma enyeghị ya ka ọ bụrụ nwunye ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.