Native Bible

Genesis 37:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.”

Genesis 37:9 in English

Genesis 37:9 · Berean Standard Bible

Then Joseph had another dream and told it to his brothers. “Look,” he said, “I had another dream, and this time the sun and moon and eleven stars were bowing down to me.”

Context

7Anyị niile nọ nʼubi na-achịkọta ọka, ngwangwa ukwu ọka nke m biliri guzoro ọtọ, ebe ukwu ọka nke unu niile gbara ukwu ọka nke m gburugburu, na-akpọ isiala nye ya.” 8Ụmụnne ya jụrụ ya, “Ị na-akọwa na ọ bụ gị ga-abụ eze anyị? Na ọ bụ gị nʼezie ga-achị anyị?” Ha kpọrọ ya asị karịa nʼihi nrọ ya na okwu ya niile. 9Josef rọkwara nrọ ọzọ, kọkwara ụmụnne ya. Ọ sịrị, “Geenụ ntị, arọrọ m nrọ ọzọ. Ma na nrọ nke ugbu a, anyanwụ na ọnwa na kpakpando iri na otu na-akpọ isiala nye m.” 10Ma mgbe ọ kọọrọ nna ya na ụmụnne ya nrọ a. Nna ya baara ya mba, sị, “Nrọ nke a ị rọrọ bụ nrọ gịnị? Ọ bụ ezie na anyị niile, mụ onwe m na nne gị na ụmụnne gị, ga-abịa na-akpọrọ gị isiala?” 11Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.