Jenesis 37:13
Genesis 37:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.” Josef zara sị, “Ọ dị mma.”
Genesis 37:13 in English
Genesis 37:13 · Berean Standard Bible
Israel said to him, “Are not your brothers pasturing the flocks at Shechem? Get ready; I am sending you to them.” “I am ready,” Joseph replied.
Context
11Ụmụnne ya kwosiri ya ekworo nʼihi ya, ma nna ya debere ihe ndị a niile nʼobi ya. 12Ka ọ dị, ụmụnne ya gara ilekọta igwe anụ ụlọ nna ha na Shekem. 13Izrel sịrị Josef, “Dịka ị maara, ụmụnne gị nọ na-eche anụ ụlọ na Shekem. Bịa, aga m eziga gị nʼebe ahụ.”
Josef zara sị, “Ọ dị mma.” 14Ya mere, ọ gwara ya, “Gaa ka ị chọpụta ma ihe ọ na-agazikwara ụmụnne gị na igwe anụ ụlọ ndị ahụ nke ọma, ma weghachiri m ozi.” O sitere na Ndagwurugwu Hebrọn zipụ ya.
Ọ bịaruru Shekem, 15ma otu nwoke hụrụ ya ka ọ na-awagharị gburugburu nʼọhịa dị nʼebe ahụ, ọ jụrụ ya, “Gịnị ka ị na-achọ?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.