Jenesis 34:15
Genesis 34:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu.
Genesis 34:15 in English
Genesis 34:15 · Berean Standard Bible
We will consent to this on one condition, that you become circumcised like us—every one of your males.
Context
13Ma ụmụ Jekọb jiri aghụghọ zaa Shekem na Hamọ nna ya mgbe ha na-agwa ha okwu, nʼihi na e merụrụ Daịna nwanne ha nwanyị. 14Ha sịrị ha, “Anyị enweghị ike ime ihe a, ị kpọrọ nwanne anyị nwanyị kpọnye nwoke a na-ebighị ugwu. Nke a ga-abụrụ anyị ihe ihere. 15Anyị nwere ike ikwenye ka ọ lụọ ya ma ọ bụrụ na unu ga-adị ka anyị, ka e bie ndị nwoke unu niile ugwu. 16Mgbe ahụ anyị ga-edunye unu ụmụ ndị inyom anyị, ma kpọrọkwa ụmụ ndị inyom unu dịka ndị nwunye anyị. Anyị ga-ebi nʼetiti unu, soro unu bụrụ otu ndị. 17Ọ bụrụ na unu agaghị ekwe ka e bie unu ugwu, anyị ga-akpọrọ nwanne anyị nwanyị laa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.