Native Bible

Genesis 32:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ”

Genesis 32:5 in English

Genesis 32:5 · Berean Standard Bible

I have oxen, donkeys, flocks, menservants, and maidservants. I have sent this message to inform my master, so that I may find favor in your sight.’”

Context

3Mgbe ahụ, Jekọb zipụrụ ndị ozi ka ha jee hụ Ịsọ nwanne ya nwoke nʼala Sia,* nʼobodo Edọm. 4O ziri ha ozi sị, “Ihe a bụ ihe unu ga-agwa nna m ukwu Ịsọ, ‘Odibo gị Jekọb kwuru sị, Ọ bụ na nke Leban ka m jere kemgbe, ọ bụkwa ebe ahụ ka m nọ ruo ugbu a. 5Enwere m ọtụtụ ehi, na ịnyịnya ibu, na igwe atụrụ na ewu, na ndị odibo ndị nwoke na ndị nwanyị. Ana m ezigara onyenwe m ozi a ka m nata ihuọma nʼebe ọ nọ.’ ” 6Mgbe ndị ozi ahụ lọghachikwutere Jekọb, ha gwara ya sị ya, “Anyị jekwuru nwanne gị nwoke Ịsọ dị ka i ziri anyị. Ugbu a, ọ na-abịa. Ọ chị narị ndị ikom anọ na-abịa izute gị.” 7Ụjọ tụrụ Jekọb nke ukwuu, obi ya jupụtakwara na nsogbu. Nʼihi nke a, o kewara ndị niile so ya ụzọ abụọ, tinyere anụ ụlọ ya, na igwe ehi ya na ịnyịnya kamel ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.