Jenesis 32:23
Genesis 32:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere.
Genesis 32:23 in English
Genesis 32:23 · Berean Standard Bible
He took them and sent them across the stream, along with all his possessions.
Context
21Mgbe o zipụchasịrị onyinye ndị ahụ niile, Jekọb rahụrụ ụra nʼụlọ ikwu ya nʼabalị ahụ. 22Nʼabalị ahụ, Jekọb biliri duru ndị nwunye ya abụọ na ndị odibo nwanyị ya abụọ, na ụmụ ya iri na otu, site nʼebe na-adịghị omimi nke iyi Jabọk kpọfee ha. 23Mgbe ọ kpọfechara ha, o bufekwara ihe niile o nwere. 24Emesịa, Jekọb lọghachiri nọdụ naanị ya. Mgbe ahụ, otu nwoke bịara gbaso ya mgba. Ha abụọ gbagidere mgba a tutu chi ebido ịbọ. 25Mgbe nwoke ahụ hụrụ na ọ pụghị imeri Jekọb na mgba ahụ, o tiri Jekọb aka nʼọkpụ, mee ka ọkpụ ya hịkwapụ site nʼọnọdụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.