Native Bible

Genesis 31:54 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ chụrụ aja nʼala ugwu ugwu ahụ, kpọọ ndị ikwu ya niile oriri. Mgbe ha richara nri, ha rahụrụ ụra nʼebe ahụ.

Genesis 31:54 in English

Genesis 31:54 · Berean Standard Bible

Then Jacob offered a sacrifice on the mountain and invited his relatives to eat a meal. And after they had eaten, they spent the night on the mountain.

Context

52Nkume ndị a a wụsara bụ akaebe, ogidi a bụkwa ihe ama. Agaghị m agabiga nkume ndị a a wụsara gafeeta nʼakụkụ nke gị ime gị ihe ọjọọ. Gị onwe gị agaghị agabiga nkume ndị a a wụsara na ogidi a gafeeta nʼakụkụ nke m ime m ihe ọjọọ. 53Ka Chineke Ebraham na Chineke Nahọ,* Chineke nna ha, bụrụ onye ikpe nʼetiti mụ na gị.” Ya mere Jekọb ji onye ahụ a na-atụ egwu nke nna ya Aịzik ṅụọ iyi. 54Ọ chụrụ aja nʼala ugwu ugwu ahụ, kpọọ ndị ikwu ya niile oriri. Mgbe ha richara nri, ha rahụrụ ụra nʼebe ahụ. 55Nʼisi ụtụtụ echi ya, Leban biliri sutu ụmụ ya ndị inyom na ụmụ ụmụ ya ọnụ. Ọ gọziri ha, hapụ ha laghachi ụlọ ha. 31:39 Ọ bụrụ na anụ ọhịa adọgbuo atụrụ e nyere onye ọzụzụ atụrụ ka o lekọta, onye ọzụzụ atụrụ ahụ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi ihe mere. Mgbe ahụ, o nweghị onye ọbụla ga-asị ya kwụọ ụgwọ ọbụla, nʼihi anụ ụlọ ahụ nwụrụ anwụ. Ọpụ 22:13 31:46 Oge ọbụla mmadụ na ibe ya gbara ndụ, ha na-eri nri a na-akpọ, nri ọgbụgba ndụ iji mesie ọgbụgba ndụ ahụ ike. 31:53 Nahọ bụ nwanne Ebraham, Jen 11:26; 22:20 bụrụkwa nna nna Leban. Jen 24:24,29 Leban bụ nwoke na-efe ọtụtụ chi. Jen 31:19

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.