Jenesis 31:37
Genesis 31:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe.
Genesis 31:37 in English
Genesis 31:37 · Berean Standard Bible
You have searched all my goods! Have you found anything that belongs to you? Put it here before my brothers and yours, that they may judge between the two of us.
Context
35Mgbe ahụ, Rechel gwara nna ya Leban sị, “Biko, ewela iwe nna m ukwu, nʼihi na enweghị m ike ibili ọtọ nʼihu gị. Anọ m nʼọnọdụ ndị inyom na-anọ kwa ọnwa.” Leban chọgharịrị ebe niile, ma ọ hụghị arụsị ezinaụlọ ndị ahụ. 36Iwe were Jekọb megide Leban. O ji iwe jụọ Leban sị, “Gịnị bụ njehie m? Gịnị bụ mmehie m mere i ji si otu a na-achụsi m ike? 37Ugbu a, ị chọgharịala nʼibu m niile, gịnị ka ị chọtara bụ nke gị? Wepụta ya nʼihu ndị ikwu gị na nʼihu ndị nke m, ka ha kpeere mụ na gị ikpe. 38“Iri afọ abụọ ka mụ na gị nọrọ. O nweghị mgbe ime pụrụ ụmụ ewu na atụrụ gị; o nwekwaghị mgbe m riri ebule si nʼigwe anụ ụlọ gị. 39*O nweghị mgbe m welataara gị anụ ụlọ nke anụ ọhịa dọgburu, kama akwụrụ m ụgwọ ha. I mekwara ka m kwụghachi gị anụ ụlọ ọbụla e zuru nʼohi, maọbụ nʼehihie, maọbụ nʼabalị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.