Jenesis 31:11
Genesis 31:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’
Genesis 31:11 in English
Genesis 31:11 · Berean Standard Bible
In that dream the angel * of God said to me, ‘Jacob!’ And I replied, ‘Here I am.’
Context
9Chineke napụrụ nna unu anụ ụlọ ya ma nye m ha. 10“Nʼoge ụmụ anụ ụlọ ji atụ ime, eweliri m anya hụ na nrọ na ụmụ mkpi niile na-agba igwe nne ewu bụ ụmụ mkpi ndị tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha nʼahụ ha. 11Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke sịrị m na nrọ, ‘Jekọb.’ Azara m sị, ‘Lee m nʼebe a.’ 12Ọ sịrị m, ‘Lelie anya gị elu, lee ka ị hụ na mkpi niile na-agba igwe nne ewu ndị a bụ mkpi ndị ahụ tụrụ agwa agwa, ndị nwere akara maọbụ ndị nwere ntụpọ ọcha. Nʼihi na ahụla m ihe niile Leban na-eme gị. 13Mụ onwe m bụ Chineke nke Betel, ebe ị wụkwasịrị mmanụ nʼogidi nkume ahụ, ebe ị kwekwara m nkwa. Ugbu a, kulie, hapụ obodo a, laghachi nʼala a nọ mụọ gị.’ ”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.