Native Bible

Genesis 30:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jekọb na-edo ụmụ igwe ewu na atụrụ ndị a nʼotu akụkụ, ma ọ na-eme ka anụ ụlọ ndị ọzọ chee ihu ha nʼanụ ụlọ Leban ndị tụrụ agwa agwa, maọbụ na-eji oji. Nʼụzọ dị otu a, ọ kewapụtaara onwe ya anụ ụlọ nke ya. O tinyekọtaghị ha nʼanụ ụlọ Leban.

Genesis 30:40 in English

Genesis 30:40 · Berean Standard Bible

Jacob set apart the young, but made the rest face the streaked dark-colored sheep in Laban’s flocks. Then he set his own stock apart and did not put them with Laban’s animals.

Context

38Ọ tọgbọrọ osisi ndị a o kpechapụtara nʼebe ewu na atụrụ ndị a na-aṅụ mmiri, ka ha cherịta ịhụ ebe igwe anụ ụlọ ndị a nọ mgbe ọbụla ha na-aṅụ mmiri. Nke a mere mgbe igwe anụ ụlọ ndị a na-enwe ekpomọkụ nke ịgba ibe ha, nʼoge ha bịara ịṅụ mmiri, 39ọ bụ nʼihu ngalaba osisi ndị a ka ha na-anọ na-agba onwe ha. Mgbe anụ ụlọ ndị a mụrụ ụmụ, ahụ ụmụ ha na-atụ agwa agwa maọbụ nwe ntụpọ. 40Jekọb na-edo ụmụ igwe ewu na atụrụ ndị a nʼotu akụkụ, ma ọ na-eme ka anụ ụlọ ndị ọzọ chee ihu ha nʼanụ ụlọ Leban ndị tụrụ agwa agwa, maọbụ na-eji oji. Nʼụzọ dị otu a, ọ kewapụtaara onwe ya anụ ụlọ nke ya. O tinyekọtaghị ha nʼanụ ụlọ Leban. 41Mgbe ọbụla nne anụ ụlọ ndị ahụ siri ike nọ nʼọnọdụ ịtụrụ ime, Jekọb na-edobe ngalaba osisi ndị ahụ nʼakụkụ ebe ha na-aṅụ mmiri nʼihu ha, ka ha nọrọ nʼebe ahụ gbaa onwe ha. 42Ma ọ bụrụ na anụ ụlọ ndị ahụ adịghị ike, Jekọb anaghị edebe osisi ndị a nʼihu ha. Ya mere, igwe ewu na atụrụ ndị na-esighị ike gaara Leban. Ma ndị siri ike gaara Jekọb.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.