Native Bible

Genesis 29:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jekọb bakwukwara Rechel. Ọ hụrụ Rechel nʼanya nke ukwuu karịa Lịa. Ọ gbakwaara Leban odibo afọ asaa ọzọ.

Genesis 29:30 in English

Genesis 29:30 · Berean Standard Bible

Jacob slept with Rachel as well, and indeed, he loved Rachel more than Leah. So he worked for Laban another seven years.

Context

28Jekọb mere ka o si kwuo. O debezuru mmemme otu izu ụka onye nke a, Leban kpọnyere ya nwa ya Rechel ka ọ bụrụ nwunye ya. 29Leban nyere nwa ya nwanyị, Rechel, odibo ya nwanyị bụ Bilha, ka ọ bụrụ odibo ya. 30Jekọb bakwukwara Rechel. Ọ hụrụ Rechel nʼanya nke ukwuu karịa Lịa. Ọ gbakwaara Leban odibo afọ asaa ọzọ. 31Mgbe Onyenwe anyị hụrụ na Lịa bụ nwanyị a kpọrọ asị, o meghere akpanwa ya, ma Rechel bụ nwanyị aga. 32Lịa tụrụ ime mụọ nwa nwoke, kpọọ ya Ruben. Nʼihi na o kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị ahụla nsogbu m, ugbu a di m ga-ahụ m nʼanya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.