Jenesis 28:4
Genesis 28:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka Chineke nye gị na ụmụ ụmụ gị ngọzị ahụ o kwere nkwa inye Ebraham. Ka i nweta ala a, nke i bi nʼime ya ugbu a dịka ọbịa, bụ ala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa inye ya.”
Genesis 28:4 in English
Genesis 28:4 · Berean Standard Bible
And may He give the blessing of Abraham to you and your descendants, so that you may possess the land where you dwell as a foreigner, the land God gave to Abraham.”
Context
2Kama bilie gaa Padan Aram nʼụlọ nna nne gị, Betuel, lụrụ nwunye site nʼụmụ ndị inyom Leban. 3Ka Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, gọzie gị, mee ka ị mịa mkpụrụ, mụbaa, ghọọ ọtụtụ mba. 4Ka Chineke nye gị na ụmụ ụmụ gị ngọzị ahụ o kwere nkwa inye Ebraham. Ka i nweta ala a, nke i bi nʼime ya ugbu a dịka ọbịa, bụ ala ahụ Chineke kwere Ebraham na nkwa inye ya.” 5Mgbe ahụ Aịzik zipụrụ Jekọb nʼije ya, ọ gara Padan Aram, nʼụlọ Leban nwa Betuel onye Aram, nwanne Ribeka onye bụ nne Jekọb na Ịsọ. 6Ịsọ hụrụ ka Aịzik siri gọzie Jekọb, ziga ya Padan Aram ka ọ gaa lụọ nwunye nʼebe ahụ, nyekwa ya iwu mgbe ọ na-agọzi ya sị, “Alụla nwanyị na Kenan,”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.