Native Bible

Genesis 27:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.”

Genesis 27:22 in English

Genesis 27:22 · Berean Standard Bible

So Jacob came close to his father Isaac, who touched him and said, “The voice is the voice of Jacob, but the hands are the hands of Esau.”

Context

20Ma Aịzik jụrụ nwa ya nwoke sị, “Olee otu i si chọta ya ngwangwa, nwa m?” Jekọb zara ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara m nke ọma.” 21Mgbe ahụ Aịzik gwara Jekọb sị, “Bịa nso ka m metụ gị aka nwa m nwoke, ka m mata ma ị bụ Ịsọ nʼeziokwu.” 22Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.” 23Ọ chọpụtaghị na ọ bụ Jekọb, nʼihi na aka ya dị ajị ajị dịka nke Ịsọ. Ya mere, ọ gọziri ya. 24Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?” Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.