Native Bible

Genesis 26:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị.

Genesis 26:3 in English

Genesis 26:3 · Berean Standard Bible

Stay in this land as a foreigner, and I will be with you and bless you. For I will give all these lands to you and your offspring, and I will confirm the oath that I swore to your father Abraham.

Context

1Nʼoge a, ụnwụ dara nʼala ahụ. Ụnwụ a dị iche nʼụnwụ mbụ nke dara nʼoge Ebraham dị ndụ. Aịzik jekwuru Abimelek* eze ndị Filistia nʼobodo Gera. 2Onyenwe anyị gosiri Aịzik onwe ya, sị, “Agakwala Ijipt; biri nʼala ahụ m sị gị biri nʼime ya. 3Nọrọ nʼala a nwa oge nta, aga m anọnyere gị ma gọziekwa gị, nʼihi na gị na ụmụ ụmụ gị ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m emezukwa iyi ahụ m ṅụrụ nye Ebraham nna gị. 4Aga m eme ka ụmụ ụmụ gị mụbaa, mee ka ha hie nne nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe. Ha ka m ga-enye ala ndị a niile. Aga m esite na mkpụrụ gị gọzie mba niile nke ụwa. 5Ihe ndị a niile ka m ga-eme nʼihi na Ebraham rubere isi ime ihe m gwara ya, na idebe iwu m na ụkpụrụ m, na ịdọ aka na ntị m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.