Jenesis 24:53
Genesis 24:53 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ kwa, ohu ahụ wepụtara ihe ịchọ mma ọlaedo, na ọlaọcha dị iche iche na uwe nye ha Ribeka. Ọ wepụtakwara onyinye ndị ọzọ dị oke ọnụahịa nye nwanne ya nwoke na nne ya.
Genesis 24:53 in English
Genesis 24:53 · Berean Standard Bible
Then he brought out jewels of silver and gold, and articles of clothing, and he gave them to Rebekah. He also gave precious gifts to her brother and her mother.
Context
51Lee Ribeka, kpọrọ ya laa, ka ọ bụrụ nwunye nwa nna gị ukwu, dịka Onyenwe anyị kwuru.” 52Mgbe ohu Ebraham nụrụ ihe ha kwuru, ọ dara nʼala kpọọ isiala nye Onyenwe anyị. 53Mgbe ahụ kwa, ohu ahụ wepụtara ihe ịchọ mma ọlaedo, na ọlaọcha dị iche iche na uwe nye ha Ribeka. Ọ wepụtakwara onyinye ndị ọzọ dị oke ọnụahịa nye nwanne ya nwoke na nne ya. 54Emesịa, mgbe ihe ndị a gasịrị, ya na ndị ikom so ya riri, ṅụọ, dinaakwa nʼabalị ahụ.
Mgbe ha si nʼụra teta, o kwuru sị, “Zilaga m ka m lakwuru nna m ukwu.” 55Ma Leban na nne ya zara sị ya, “Ka nwantakịrị nwanyị a nọnyere anyị ihe dịka ụbọchị iri tupu o soro gị laa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.