Jenesis 24:36
Genesis 24:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sera nwunye nna m ukwu mụtaara ya otu nwa nwoke mgbe o merela agadi. Ihe niile nna m ukwu nwere ka o nyefere nwa ahụ nʼaka.
Genesis 24:36 in English
Genesis 24:36 · Berean Standard Bible
My master’s wife Sarah has borne him a son in her old age, and my master has given him everything he owns.
Context
34Ya mere, ọ sịrị, “Abụ m ohu Ebraham. 35Onyenwe anyị agọziela nna m ukwu, mee ya ka ọ bụrụ ọgaranya. O nyela ya igwe atụrụ, na igwe ehi, na ọlaọcha na ọlaedo, na ọtụtụ ndị ohu nwoke na nwanyị, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya ibu. 36Sera nwunye nna m ukwu mụtaara ya otu nwa nwoke mgbe o merela agadi. Ihe niile nna m ukwu nwere ka o nyefere nwa ahụ nʼaka. 37Nna m ukwu mere ka m ṅụọra ya iyi sị, ‘Ị gaghị esite nʼetiti ụmụ ndị inyom Kenan ndị anyị bi nʼala ha lụtara nwa m nwoke nwunye. 38Kama ị ga-aga nʼezinaụlọ nna m, na nke ndị ikwu m chọtara nwa m nwoke nwunye.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.