Jenesis 24:17
Genesis 24:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ohu ahụ mere ngwangwa jekwuru ya sị ya, “Biko nyetụ m mmiri si nʼite mmiri gị.”
Genesis 24:17 in English
Genesis 24:17 · Berean Standard Bible
So the servant ran to meet her and said, “Please let me have a little water from your jar.”
Context
15Tupu o kpechaa ekpere a, lekwa Ribeka ada Betuel, nwa nwoke Milka, onye bụ nwunye Nahọ, nwanne Ebraham. Ọ na-apụta bukwasị ite nʼubu ya. 16Ọ bụ nwaagbọghọ mara mma nke ukwuu, onye na-amatabeghị nwoke, nke nwoke ọbụla na-edinabeghị. Ọ gara nʼolulu mmiri kujuo ite ya si nʼebe ahụ na-arịgopụta. 17Ohu ahụ mere ngwangwa jekwuru ya sị ya, “Biko nyetụ m mmiri si nʼite mmiri gị.” 18Ọ mere ngwangwa budata ite ahụ nʼaka ya, hulata ya si ya, “Ṅụọ, onyenwe m.” 19Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị, “Aga m ekutekwa mmiri nye ịnyịnya kamel gị ndị a ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.