Jenesis 24:12
Genesis 24:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, mee ka ihe gaara m nke ọma taa. Gosi nna m ukwu Ebraham obi ebere gị.
Genesis 24:12 in English
Genesis 24:12 · Berean Standard Bible
“O LORD, God of my master Abraham,” he prayed, “please grant me success today, and show kindness to my master Abraham.
Context
10Emesịa, ohu a duuru ịnyịnya kamel iri nʼime ndị nna ya ukwu nwere pụọ. O sitekwara nʼaka nna ya ukwu were ihe ọma dị iche iche maka njem a, gawa Aram Naharaim, rute nʼobodo Nahọ. 11O mere ka ịnyịnya kamel ndị ahụ makpuru ala nʼakụkụ olulu mmiri dị nʼazụ obodo ahụ. Ọ bụ nʼoge anyasị, oge ụmụ nwanyị ji apụta iseta mmiri nʼebe ahụ. 12Mgbe ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị, Chineke nke nna m ukwu Ebraham, mee ka ihe gaara m nke ọma taa. Gosi nna m ukwu Ebraham obi ebere gị. 13Lee, ana m eguzo nʼakụkụ isi iyi mmiri a, ụmụ nwanyị ndị obodo a na-abịa iseta mmiri. 14Kwere ka o si otu a dịrị na nwaagbọghọ nke m ga-asị, ‘Biko, zie ite gị ka m ṅụrụ mmiri.’ Ọ bụrụ na onye ahụ asị m, ‘Ṅụọ, aga m ekutekwa mmiri nke ịnyịnya kamel gị ga-aṅụ,’ ka onye ahụ bụrụ onye ị họpụtara ohu gị Aịzik. Nʼụzọ dị otu a ka m ga-esi mata na i gosila nna m ukwu obi ebere.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.