Jenesis 20:12
Genesis 20:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ewezugakwa nke a, ọ bụ nwanna m nwanyị, nʼihi na otu nna mụrụ anyị, ma ọ bụghị otu nne, tupu ọ bụrụ nwunye m.
Genesis 20:12 in English
Genesis 20:12 · Berean Standard Bible
Besides, she really is my sister, the daughter of my father—though not the daughter of my mother—and she became my wife.
Context
10Abimelek jụrụ Ebraham sị, “Ọ bụ gịnị ka ị hụrụ i jiri mee omume dị otu a?” 11Ebraham zara ya, “Nʼihi na asịrị m nʼobi m, ‘Nʼezie, ịtụ egwu Chineke adịghị nʼebe a. Ha ga-egbu m nʼihi nwunye m.’ 12Ewezugakwa nke a, ọ bụ nwanna m nwanyị, nʼihi na otu nna mụrụ anyị, ma ọ bụghị otu nne, tupu ọ bụrụ nwunye m. 13Mgbe Chineke sitere nʼezinaụlọ nna m zipụ m ije ebe dị anya, agwara m ya sị, ‘Otu a ka ị ga-esi gosi na ị hụrụ m nʼanya, ebe ọbụla anyị gara, kwuo gbasara m, “Onye a bụ nwanne m.” ’ ” 14Mgbe ahụ, Abimelek dupụtara atụrụ, na ehi, na ndị ohu ndị ikom, na ndị ohu ndị inyom, nye Ebraham. Ọ kpọnyekwara ya Sera nwunye ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.