Jenesis 19:34
Genesis 19:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼechi ya, ada gwara nwanne ya nke nta, “Mụ na nna anyị dinara nʼabalị gara aga. Ka anyị mee ka ọ ṅụọkwa mmanya nʼabalị taa, ka ị gaakwa ka gị na ya dina. Ka anyị mee ka agbụrụ anyị dịgide site na nna anyị.”
Genesis 19:34 in English
Genesis 19:34 · Berean Standard Bible
The next day the older daughter said to the younger, “Look, I slept with my father last night. Let us get him drunk with wine again tonight so you can go in and sleep with him and we can preserve our father’s line.”
Context
32Ka anyị mee ka nna anyị ṅụọ mmanya, ka anyị na ya dinakọọ, ka anyị chebe agbụrụ anyị site na nna anyị.” 33Nʼabalị ahụ, ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya, nke ada banyere soro nna ya dina. Ha abụọ nwere mmekọ. Ma ọ amaghị mgbe ada ya dinara maọbụ mgbe o bilikwara. 34Nʼechi ya, ada gwara nwanne ya nke nta, “Mụ na nna anyị dinara nʼabalị gara aga. Ka anyị mee ka ọ ṅụọkwa mmanya nʼabalị taa, ka ị gaakwa ka gị na ya dina. Ka anyị mee ka agbụrụ anyị dịgide site na nna anyị.” 35Ha mere ka nna ha ṅụọ mmanya nʼabalị ahụ, ada ya nke nta banyere ya na nna ya dinaa. Dịka ọ dịkwa na mbụ, nna ha amataghị mgbe o dinara ala maọbụ mgbe o bilitere. 36Ya mere, ụmụ ndị inyom Lọt abụọ ndị a tụrụ ime site nʼaka nna ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.