Native Bible

Genesis 19:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu Onyenwe anyị nʼụbọchị gara aga.

Genesis 19:27 in English

Genesis 19:27 · Berean Standard Bible

Early the next morning, Abraham got up and returned to the place where he had stood before the LORD.

Context

25Otu a ka o si kwatuo obodo ndị ahụ niile dị na mbara ala ahụ niile, na ndị niile bi nʼobodo ndị ahụ. O kwatukwara ihe niile na-epu nʼala. 26Ma mgbe nwunye Lọt lere anya nʼazụ, otu mgbe ahụ, ọ ghọrọ ogidi nnu. 27Nʼụtụtụ echi ya, Ebraham biliri jeruo ebe ahụ o guzoro nʼihu Onyenwe anyị nʼụbọchị gara aga. 28Ọ lepụrụ anya nʼebe obodo Sọdọm na Gọmọra dị, na nʼebe mbara ala ndị ahụ niile dị. Ọ hụrụ anwụrụ ọkụ dị ukwuu nke si nʼala ahụ na-alali elu. Anwụrụ ọkụ a dị ka anwụrụ ọkụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-enwusi ike. 29Ya mere, mgbe Chineke bibiri obodo ndị ahụ dị na mbara ala, o chetara Ebraham, kpọpụta Lọt site nʼoke mbibi ahụ e bibiri obodo ndị ahụ Lọt bi nʼime ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.