Native Bible

Genesis 19:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru Onyenwe anyị ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.”

Genesis 19:13 in English

Genesis 19:13 · Berean Standard Bible

because we are about to destroy this place. For the outcry to the LORD against its people is so great that He has sent us to destroy it.”

Context

11Ha tiri ndị ikom ndị ahụ nọ nʼọnụ ụzọ ihe otiti nke mere ka ha kpụọ ìsì, onye ukwu ha na onye nta ha. Nʼihi ya, ha enweghị ike ịchọta ọnụ ụzọ ụlọ ahụ. 12Ndị ikom abụọ ahụ gwara Lọt sị, “O nwere onye ọbụla ọzọ i nwere nʼebe a? Ndị ọgọ nwoke, maọbụ ụmụ gị ndị ikom, maọbụ ụmụ gị ndị inyom, na ọ bụ onye ọbụla bụ nke gị nʼobodo a. Site nʼebe a kpọpụ ha! 13Nʼihi na anyị na-aga imebi obodo a, mkpu akwa ruru Onyenwe anyị ntị megide ndị bi nʼobodo a adịla ukwuu, nke mere o ji zite anyị ibibi ya.” 14Ya mere, Lọt pụrụ gaa gwa ndị ọgọ ya nwoke, ndị na-akwado ịlụ ụmụ ya ndị inyom, sị ha, “Ọsọ, sinụ nʼobodo a pụọ. Nʼihi na Onyenwe anyị na-akwado ibibi ya.” Ma ndị ọgọ ya nwoke ndị a chere na ọ na-egwu egwu. 15Nʼụtụtụ, mgbe chi na-abọta, ndị mmụọ ozi a kwagidere Lọt sị ya, “Ọsọ, kpọrọ nwunye gị na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a site nʼebe a gbapụ, ma ọ bụghị ya, a ga-ekpochapụ unu nʼihi ajọ omume ndị obodo a.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.