Jenesis 17:15
Genesis 17:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera.
Genesis 17:15 in English
Genesis 17:15 · Berean Standard Bible
Then God said to Abraham, “As for Sarai your wife, do not call her Sarai, for her name is to be Sarah.*
Context
13A ga-ebi ha niile ugwu. Ma a mụrụ ha nʼezinaụlọ gị ma i ji ego zụta ha site nʼaka onye mba ọzọ. Ọgbụgba ndụ m nke ga-apụta ihe nʼanụ ahụ gị bụ ọgbụgba ndụ ebighị ebi. 14Nwoke ọbụla a na-ebighị ugwu nke anụ ahụ ka a ga-ebipụ site nʼetiti ụmụnna ya. Nʼihi na o mehiela megide ọgbụgba ndụ m.” 15Chineke gwakwara Ebraham sị, “Ma nʼebe Serai nwunye gị nọ, ị gaghị akpọkwa ya Serai ọzọ, kama aha ya ga-abụ Sera. 16Aga m agọzi ya, sitekwa na ya nye gị nwa nwoke. Aga m agọzi ya ruo na ọ ga-abụ nne nke ọtụtụ mba. Ndị eze ga-achị ọtụtụ mmadụ ga-esite na ya pụta.” 17Ebraham dara kpuo ihu nʼala, chịakwa ọchị nʼobi ya sị, “Ọ bụ onye gbara narị afọ ka a ga-amụrụ nwa? Sera, onye gbara iri afọ itoolu ọ ga-amụ nwa?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.