Native Bible

Genesis 17:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu.

Genesis 17:10 in English

Genesis 17:10 · Berean Standard Bible

This is My covenant with you and your descendants after you, which you are to keep: Every male among you must be circumcised.

Context

8Ala Kenan niile, ebe ị nọ ugbu a dịka ọbịa ka m ga-enye gị na ụmụ ụmụ gị ga-esote gị dịka ihe nketa ebighị ebi. Aga m abụ Chineke ha.” 9Chineke gwara Ebraham okwu sị ya, “Ma nʼebe ị nọ, ị ghaghị irube isi imezu ihe ọgbụgba ndụ m kwuru, gị onwe gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ruo ọgbọ niile. 10Nke a bụ ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na gị na ụmụ ụmụ gị ndị ga-esote gị, ọgbụgba ndụ nke unu na-aghaghị idebe. A ga-ebi nwoke ọbụla nʼetiti unu ugwu. 11A ga-ebi unu ugwu, bipụ elu ahụ nke anụ ahụ unu. Nke a ga-abụ ihe ama nke ọgbụgba ndụ dị nʼetiti mụ na unu. 12Nʼoge ọ gbara mkpụrụ ụbọchị asatọ, unu ga-ebi nwoke ọbụla nʼagbụrụ unu ugwu: ndị a mụrụ nʼụlọ, maọbụ ndị eji ego zụta site nʼaka ndị mba ọzọ, ndị na-esighị na mkpụrụ nke afọ gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.