Jenesis 16:3
Genesis 16:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan.
Genesis 16:3 in English
Genesis 16:3 · Berean Standard Bible
So after he had lived in Canaan for ten years, his wife Sarai took her Egyptian maidservant Hagar and gave her to Abram to be his wife.
Context
1Ma Serai nwunye Ebram, amụtaghị nwa. Serai nwere odibo nwanyị onye Ijipt, aha ya bụ Hega. 2Ya mere ọ gwara Ebram sị, “Lee, ugbu a, Onyenwe anyị egbochiela m ịmụta ụmụ.* Ugbu a, bakwuru nwanyị na-ejere m ozi. Ma eleghị anya, aga m esi na ya wulite ezinaụlọ m.”
Ebram kweere ihe Serai kwuru. 3Ya mere Serai nwunye Ebram, duuru Hega, odibo nwanyị ya, onye Ijipt, dunye Ebram ka ọ bụrụ nwunye ya. Ihe a mere na ngwụcha afọ iri site na mgbe Ebram bịara biri nʼala Kenan. 4Ebram na Hega dinara. Hega tụụrụ ime.
Ma mgbe Hega matara na ọ dịrịla ime, ọ malitere ileda nne ya ukwu bụ Serai anya. 5Mgbe ahụ, Serai gwara Ebram sị, “Ọ bụ gị butere ahụhụ a m nọ nʼime ya. Ọ bụ m were nwaodibo nwanyị m kunye gị nʼaka, ma ugbu a ọ hụrụ na ọ dị ime, abụrụla m onye ọ na-eleda anya. Ka Onyenwe anyị kpee ikpe a nʼetiti mụ na gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.