Native Bible

Genesis 15:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.”

Genesis 15:5 in English

Genesis 15:5 · Berean Standard Bible

And the LORD took him outside and said, “Now look to the heavens and count the stars, if you are able.” Then He told him, “So shall your offspring be.”*

Context

3Ebram gara nʼihu kwuo sị, “Ebe ọ bụ na m amụtaghị ụmụ, ọ bụ ohu nọ nʼụlọ m ga-eketa akụ m.” 4Ma okwu Onyenwe anyị rutere ya, “Nwoke a agaghị eketa ihe i nwere, kama nwa nwoke nke ga-esi nʼahụ gị pụta ga-eketa ihe i nwere.” 5Mgbe ahụ, Onyenwe anyị kpọpụtara Ebram nʼezi sị ya, “Lelie anya gị elu na mbara eluigwe, gụọ kpakpando niile ị hụrụ ọnụ, ma ị ga-enwe ike ịgụta ha.” Ọ gwara ya sị, “Otu a ka mkpụrụ gị ga-adị. A gaghị agụta ha ọnụ.” 6Ebram kweere nʼihe Onyenwe anyị kwuru. Nʼihi nke a, a gụnyere ya okwukwe a dịka ezi omume. 7Onyenwe anyị gwakwara ya sị, “Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, onye si nʼala Ụọ nke ndị Kaldịa kpọpụta gị, inye gị ala a ka ọ bụrụ ihe nweta gị.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.