Native Bible

Genesis 14:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha buuru Lọt, nwa nwanne Ebram, onye bi na Sọdọm na ihe niile o nwere, buru ha na-ala ebe ha si bịa.

Genesis 14:12 in English

Genesis 14:12 · Berean Standard Bible

They also carried off Abram’s nephew Lot and his possessions, since Lot was living in Sodom.

Context

10Ma Ndagwurugwu Sidim jupụtara nʼolulu apịtị. Mgbe ndị agha eze Sọdọm na Gọmọra bidoro ịgba ọsọ. Ụfọdụ nʼime ha dabanyere nʼime olulu ndị a, ma ndị fọdụrụ gbapụrụ ọsọ gbaga nʼugwu. 11Ma eze anọ ndị a banyere nʼime obodo Sọdọm na Gọmọra bukọrọ akụ ha, na ihe oriri ha niile laa. 12Ha buuru Lọt, nwa nwanne Ebram, onye bi na Sọdọm na ihe niile o nwere, buru ha na-ala ebe ha si bịa. 13Ma otu onye gbara ọsọ ndụ site nʼebe ahụ gara kọọrọ Ebram onye Hibru ihe mere. Nʼoge a, Ebram bi nʼebe dị nso nʼosisi ukwu nke Mamre, onye Amọrị, nwanne Eshkọl na Anea, ndị ha na Ebram gbara ndụ. 14Mgbe Ebram nụrụ na adọrọla Lọt nwa nwanne ya nʼagha, ọ kpọkọtara ndị ikom a zụrụ azụ na-ejere ya ozi, ndị a mụrụ nʼụlọ ya. Ọnụọgụgụ ha dị narị ndị ikom atọ na iri na asatọ, ha chụrụ ndị agha ahụ ọsọ tutu ha erute Dan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.