Native Bible

Genesis 13:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm.

Genesis 13:12 in English

Genesis 13:12 · Berean Standard Bible

Abram lived in the land of Canaan, but Lot settled in the cities of the plain and pitched his tent toward Sodom.

Context

10Lọt lelitere anya hụ na mbara ala Jọdan bụ ala mmiri na-ezokwasị nke ọma, ala dịka ubi a gbara ogige Onyenwe anyị, dịka ala ndị Ijipt nke dị na nso nso Zoa. (Ihe a mere tupu Onyenwe anyị ebibie obodo Sọdọm na Gọmọra.) 11Ya mere, Lọt họọrọ nye onwe ya mbara ala Jọdan niile, chee ihu ịga nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ. Ya na Ebram kewara. 12Ebram nọdụrụ nʼala Kenan, ma Lọt gara biri nʼetiti obodo ndị ahụ dị na mbara ala. Ọ mara ụlọ ikwu ya nso nso obodo Sọdọm. 13Ma ndị Sọdọm bụ ndị obi tara mmiri, ndị na-emehie nke ukwuu megide Onyenwe anyị. 14Mgbe Lọt siri nʼebe ahụ pụọ, Onyenwe anyị gwara Ebram okwu sị ya, “Site nʼebe ahụ ị nọ lelie anya gị, lee anya nʼugwu na ndịda, nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.