Jenesis 1:23
Genesis 1:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise.
Genesis 1:23 in English
Genesis 1:23 · Berean Standard Bible
And there was evening, and there was morning—the fifth day.
Context
21Ya mere Chineke kere anụ ukwu niile bi na mmiri, na anụ niile nwere ndụ bi na mmiri, na ụdị ihe ọbụla nwere ndụ na-akpụgharị akpụgharị ndị jupụtara na mmiri, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ ufe niile dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma. 22Chineke gọziri ha, sị ha, “Mụbaanụ, dịkwanụ ukwuu nʼọnụọgụgụ, jupụtanụ osimiri niile. Ka anụ ufe dịkwa ukwuu nʼọnụọgụgụ nʼelu ụwa.” 23Uhuruchi dị, ụtụtụ dịkwa. Ọ bụrụ ụbọchị nke ise. 24Chineke kwuru sị, “Ka ala wepụta ụmụ anụ dị iche iche nwere ndụ dịka ụdịdị ha si dị: anụ ụlọ, anụ na-akpụgharị nʼala, na anụ ọhịa, nke ọbụla dịka ụdịdị ya si dị.” O si otu a dịrị. 25Chineke mere ụmụ anụ ọhịa, dịka ụdịdị ha si dị, mee anụ ụlọ, dịka ụdịdị ha si dị, na anụ niile nwere ndụ nke na-akpụgharị nʼala dịka ụdịdị ha si dị. Chineke lere anya hụ na ọ dị mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.