Ndị Galeshịa 4:8
Galatians 4:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge gara aga, mgbe unu na-amaghị Chineke, unu bụ ohu nye chi niile nke na-abụghị dịka ha si pụta ụwa.
Galatians 4:8 in English
Galatians 4:8 · Berean Standard Bible
Formerly, when you did not know God, you were slaves to those who by nature are not gods.
Context
6Ebe unu bụ ụmụ, Chineke zitere Mmụọ Ọkpara ya, ka ọ bịa biri nʼobi anyị, na-eti mkpu na-asị, “Abba, Nna.” 7Ugbu a, ị bụkwaghị ohu, kama ị bụ nwa. Ebe ị bụ nwa, e meekwala ka ị bụrụ onye nketa site na Chineke. 8Nʼoge gara aga, mgbe unu na-amaghị Chineke, unu bụ ohu nye chi niile nke na-abụghị dịka ha si pụta ụwa. 9Ma ugbu a, unu matarala Chineke, ka m ga-asị na Chineke amatala ndị unu bụ, gịnị mere unu ji chọọ ịtụgharị azụ laghachi nʼokpukpe ndị ahụ na-enweghị isi, nke ike ọbụla na-adịghị nʼime ha? Unu chọrọ ka ha mee unu ndị ohu ha ọzọkwa? 10Unu na-edebe ụbọchị ụfọdụ, na ọnwa ụfọdụ, na oge ụfọdụ, na afọ ụfọdụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.