Native Bible

Galatians 4:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Egwu na-atụ m na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti unu abụrụla ihe efu.

Galatians 4:11 in English

Galatians 4:11 · Berean Standard Bible

I fear for you, that my efforts for you may have been in vain.

Context

9Ma ugbu a, unu matarala Chineke, ka m ga-asị na Chineke amatala ndị unu bụ, gịnị mere unu ji chọọ ịtụgharị azụ laghachi nʼokpukpe ndị ahụ na-enweghị isi, nke ike ọbụla na-adịghị nʼime ha? Unu chọrọ ka ha mee unu ndị ohu ha ọzọkwa? 10Unu na-edebe ụbọchị ụfọdụ, na ọnwa ụfọdụ, na oge ụfọdụ, na afọ ụfọdụ. 11Egwu na-atụ m na ọrụ niile m rụrụ nʼetiti unu abụrụla ihe efu. 12Ezi ụmụnna m, arịọọ m unu, meenụ onwe unu dị ka mụ onwe m, nʼihi na mụ onwe m emela onwe m ka m dị ka unu. O nweghị ihe ọjọọ ọbụla unu mere m. 13Unu maara na ọ bụ nʼime adịghị ike nke anụ ahụ ka m ji kwusaara unu oziọma a.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.