Ndị Galeshịa 3:23
Galatians 3:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè.
Galatians 3:23 in English
Galatians 3:23 · Berean Standard Bible
Before this faith came, we were held in custody under the law, locked up until faith should be revealed.
Context
21Iwu ahụ ọ na-emegide nkwa nke Chineke? Mba. Nʼezie ọ dịghị. Nʼihi na a sị na e nwere iwu dị nke pụrụ inye mmadụ ndụ, mgbe ahụ, ezi omume gaara abịara mmadụ site nʼiwu. 22Ma akwụkwọ nsọ mechibidoro ihe niile nʼokpuru mmehie ka e nwee ike nye ndị kwere ekwe nkwa ahụ e kwere ha site nʼokwukwe nʼime Jisọs Kraịst. 23Ma tupu okwukwe abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutu ruo mgbe a ga-eme ka okwukwe pụta ìhè. 24Ya mere, iwu bụ onye nlekọta anyị, ruo mgbe Kraịst bịara, ka a gụọ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe. 25Ma ebe ọ bụ na okwukwe abịala, anyị anọkwaghị nʼokpuru onye nlekọta ọzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.