Ndị Galeshịa 2:12
Galatians 2:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya.
Galatians 2:12 in English
Galatians 2:12 · Berean Standard Bible
For before certain men came from James, he used to eat with the Gentiles. But when they arrived, he began to draw back and separate himself, for fear of those in the circumcision group.
Context
10Ọ bụ naanị otu ihe ka ha rịọrọ anyị, nke bụ ka anyị cheta ndị ogbenye. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike ime. 11Ma mgbe Sefas bịaruru Antiọk, eguzogidere m ya nʼihu ya, nʼihi na ihe o mere mara ya ikpe. 12Tupu ndị Jemis zitere abịaruo ebe ahụ, ya na ndị mba ọzọ na-erikọ nri, ma mgbe ha rutere, ọ wepụrụ aka na nri laghachi azụ nʼihi na egwu ndị e biri ugwu na-atụ ya. 13Ndị Juu ụfọdụ sonyekwara ya inwe ihu abụọ a, nke mere na e si otu a duhiekwa Banabas nʼonwe ya. 14Ma mgbe m hụrụ na ha adịghị eme ihe dị ka eziokwu nke oziọma ahụ si dị, agwara m Sefas okwu nʼihu ha niile, sị, “Ọ bụrụ na gị nwa onye Juu na-ebi ndụ dịka onye mba ọzọ, na-abụghị dịka onye Juu, olee otu ị ga-esi manye ndị mba ọzọ ka ha na-ebi ndụ dịka ndị Juu?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.