Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị.

Ezra 9:4 in English

Ezra 9:4 · Berean Standard Bible

Then everyone who trembled at the words of the God of Israel gathered around me because of the unfaithfulness of the exiles, while I sat there in horror until the evening offering.

Context

2Ha alụtarala onwe ha nwunye site nʼụmụ ndị inyom mba ọzọ ndị a, lụtakwara ụmụ ha ndị ikom. Ha agwakọtala mkpụrụ nsọ na ndị dị iche iche nọ ha gburugburu. Ọ bụ ndị ndu na ndịisi ọchịchị ha bụ ndị butere ụzọ nʼibi ndụ ekwesighị ntụkwasị obi a.” 3Ma mgbe m nụrụ nke a, adọwara m uwe ahụ m na uwe mwụda m,* dọpụkwa ụfọdụ agịrị isi nke isi m, na ajị afụọnụ m, nọdụkwa ala nʼọnọdụ mgbagwoju anya. 4Mgbe ahụ, ndị niile mara jijiji nʼokwu Chineke nke Izrel, gbakọtara m gburugburu nʼihi ekwesighị ntụkwasị obi nke ndị ahụ e mere ka ha jee biri na mba ọzọ lọtaranụ. Mụ onwe m nọkwa nʼọnọdụ mgbagwoju anya ruo oge ịchụ aja nsure ọkụ nke anyasị. 5Nʼikpeazụ, nʼoge aja uhuruchi, esitere m nʼiweda onwe m ala bilie, eji m uwe na uwe mwụda dọkara adọka daa nʼala nʼikpere m, chilie aka m abụọ elu, tikuo Onyenwe anyị Chineke m 6nʼekpere sị, “Ihere na-eme m, Chineke m, amaghị otu m ga-esi lelie anya m lekwasị gị nʼihu, nʼihi na mmehie anyị babigara ụba oke, ikpe ọmụma dị na-eche anyị dịkwa ukwuu, nʼezie o ruola eluigwe.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.