Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ana m enyekwa iwu na ndị nchụaja niile, ndị Livayị niile, ndị ọbụ abụ niile, ndị nche niile, ndị ozi ụlọnsọ niile, na ndị ọzọ niile na-arụrụ Chineke ọrụ, agaghị atụ ụtụ ọbụla.

Ezra 7:24 in English

Ezra 7:24 · Berean Standard Bible

And be advised that you have no authority to impose tribute, duty, or toll on any of the priests, Levites, singers, doorkeepers, temple servants, or other servants of this house of God.

Context

22Ọ bụladị ruo ọlaọcha dị otu narị talenti, ya na narị akpa ọka wiiti ise, na narị galọọnụ mmanya vaịnị isii, na narị efa* nke mmanụ oliv na nnu nʼọtụtụ ọbụla, dịka ọ chọrọ ya. 23Ihe ọbụla ọzọ, nke Chineke nke eluigwe chọrọ, ka e mee ha nʼụzọ kwesiri nye maka owuwu ụlọnsọ Chineke nke eluigwe. Nʼihi gịnị ka iwe Chineke ga-eji dakwasị eze na ụmụ ya ndị ikom? 24Ana m enyekwa iwu na ndị nchụaja niile, ndị Livayị niile, ndị ọbụ abụ niile, ndị nche niile, ndị ozi ụlọnsọ niile, na ndị ọzọ niile na-arụrụ Chineke ọrụ, agaghị atụ ụtụ ọbụla. 25“Ugbu a, Ezra, ị ga-eji amamihe Chineke gị nyere gị họpụta ndị ikpe, na ndịisi, ndị ga-achị obodo niile dị nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis. Ọ bụrụ na ha amazighị iwu Chineke nke ọma, ị ga-akụziri ha. 26Ahụhụ ga-adịrị onye ọbụla jụrụ idebe iwu Chineke, na iwu eze, ga-abụ ọnwụ, maọbụ nchụpụ site nʼala ya gaa mba ọzọ, maọbụ ịnakọrọ ya ihe niile o nwere, maọbụ ịtụba ya nʼụlọ mkpọrọ.”*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.