Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị ahụ emere ka ha gaa biri nʼala ọzọ, mere Mmemme Ngabiga nʼabalị iri na anọ nke ọnwa mbụ.

Ezra 6:19 in English

Ezra 6:19 · Berean Standard Bible

On the fourteenth day of the first month, the exiles kept the Passover.

Context

17Nʼihi ido ụlọ ahụ nsọ, ha ji oke ehi dị otu narị nʼọnụọgụgụ, na narị ebule abụọ, na narị atụrụ anọ chụọ aja, werekwa mkpi iri na abụọ chụọ aja mmehie nʼihi ndị Izrel niile, dịka ebo niile nke Izrel si dị. 18Ha guzobere ndị nchụaja na nkewa ha, ndị Livayị nʼotu ha maka ije ozi nke Chineke na Jerusalem, dịka e dere ya nʼakwụkwọ iwu Mosis. 19Ndị ahụ emere ka ha gaa biri nʼala ọzọ, mere Mmemme Ngabiga nʼabalị iri na anọ nke ọnwa mbụ. 20Ndị nchụaja na ndị Livayị edoola onwe ha ọcha, ha niile dịkwa ọcha. Ndị Livayị nʼonwe ha gburu ọtụtụ atụrụ Mmemme Ngabiga maka ndị nchụaja, na ndị Livayị ndị ọzọ, na ndị ahụ niile lọtara alọta site na mba ọzọ. 21Ya mere, ndị Izrel niile bụ ndị ahụ lọtara site nʼebe e mere ka ha gaa biri riri ihe ahụ, ha na ndị ahụ niile kewapụrụ onwe ha juu ibi ajọọ ndụ nke ndị mba ọzọ bi nʼala ahụ na-ebi, nʼihi ịchọ Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.