Ezra 5:6
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs:
Ezra 5:6 in English
Ezra 5:6 · Berean Standard Bible
This is the text of the letter that Tattenai the governor of the region west of the Euphrates, Shethar-bozenai, and their associates, the officials in the region, sent to King Darius.
Context
4Ha jụkwara ha ajụjụ sị: “Gịnị bụ aha ndị na-arụ ụlọ a?” 5Ma anya Chineke ha dịkwasịrị nʼahụ ndị okenye ndị Juu, ha akwụsịghị ha ọrụ ruo mgbe akwụkwọ ozi ruru Daraiọs, na mgbe ọsịsa ya bịara site nʼakwụkwọ ozi. 6Nke a bụ akwụkwọ ozi Tatenai, onye na-achị ala dị nʼọdịda anyanwụ Yufretis, na Sheta Bozenai, na ndịisi ọzọ degara eze Daraiọs: 7Ha zigara ya akwụkwọ ozi, nke e si otu a dee,
Daraiọs bụ eze nwe akwụkwọ a,
Anyị ekelee gị. 8Ọ dị mma ka eze mata na anyị jeruru mpaghara ala Juda, nʼebe ahụ ụlọnsọ ukwu Chineke dị. Anyị chọpụtara na ndị ahụ ji nkume a wara awa na-ewu ya, na-edokwa osisi na-elu mgbidi ya. Ọrụ ahụ na-agakwa nʼihu nke ọma na-esepụghị aka nʼokpuru nlekọta ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.