Ezra 4:19
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze,* bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara.
Ezra 4:19 in English
Ezra 4:19 · Berean Standard Bible
I issued a decree, and a search was conducted. It was discovered that this city has revolted against kings from ancient times, engaging in rebellion and sedition.
Context
17Eze ahụ si otu a saa akwụkwọ ahụ,
Ọ sịrị ha, Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu ha bi na Sameria ruo nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis.
Ndeewonụ. 18Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m. 19Enyere m iwu ka e nyochaa chọpụta, e mere nyochaa, a chọpụtakwara ya nʼakwụkwọ na obodo a siterị nʼoge gara aga bụ obodo na-ebuli onwe ya megide ọtụtụ ndị eze,* bụrụkwa ebe na-akpali nnupu isi na okwu na-eweta ọgbaaghara. 20Jerusalem e nweela ụfọdụ ndị eze nke chịrị nʼIzrel, ndị dị ike a maara aha ha, ndị alaeze ha gbasara rute nʼosimiri Yufretis, ndị a na-atụkwara ụtụ dị iche iche. 21Ugbu a, nye iwu ka ndị ikom ndị ahụ kwụsị ọrụ, ka a ghara iwuzi obodo a tutu ruo mgbe m ga-enye iwu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.