Ezra 4:16
Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ.
Ezra 4:16 in English
Ezra 4:16 · Berean Standard Bible
We advise the king that if this city is rebuilt and its walls are restored, you will have no dominion west of the Euphrates.
Context
14Ebe anyị na-asọpụrụ gị dịka nna anyị ukwu, anyị achọghị ka ihe ọjọọ mee nʼalaeze gị, ya mere anyị ji kpebie idere gị akwụkwọ a. 15Anyị chọrọ ka i leba anya nʼakwụkwọ akụkọ nke mgbe ochie, ka ị chọpụta na ọ dịghị mgbe Jerusalem na-ejighị bụrụ obodo nnupu isi. Nʼezie, ọ bụ nʼihi nnupu isi a na nkwulu nke ha na-ekwulu ndị eze dị iche iche, ka e ji bibie ya na mbụ. 16Anyị chọrọ ka ị mata na ọ bụrụ na e wuchaa mgbidi obodo a, ọ ga-esi ike ka akụkụ alaeze gị a, nke dị ruo nʼosimiri Yufretis, bụrụkwa nke gị ọzọ. 17Eze ahụ si otu a saa akwụkwọ ahụ,
Ọ sịrị ha, Rehum onyeisi ọchịchị, na Shimshai ode akwụkwọ, na ndị otu ha bi na Sameria ruo nʼọdịda anyanwụ nke osimiri Yufretis.
Ndeewonụ. 18Akwụkwọ ozi ahụ unu zitere anyị, agụọla ma tapịakwaa ya nʼihu m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.