Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.

Ezra 3:6 in English

Ezra 3:6 · Berean Standard Bible

On the first day of the seventh month, the Israelites began to offer burnt offerings to the LORD, although the foundation of the temple of the LORD had not been laid.

Context

4Ha mekwara mmemme ụlọ Ikwu dịka e dere ya nʼiwu Mosis, chụọkwa aja nsure ọkụ dị iche iche nʼụbọchị niile nke mmemme ahụ. 5Mgbe ihe ndị a gasịrị, ha chụrụ aja nsure ọkụ nke a na-achụ mgbe niile, na nke aja maka ọnwa ọhụrụ, na aja ndị ọzọ maka mmemme ndị ọzọ dị nsọ a kara aka nke Onyenwe anyị. Ha chụkwara aja onyinye nke ha ji nye Onyenwe anyị onyinye afọ ofufu. 6Ndị nchụaja bidoro ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị nʼabalị mbụ nke ọnwa nke asaa. Ọ bụ ezie na a tọbeghị ntọala ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 7Ha nyere ndị ọrụ na-edo nkume na ndị ọkpọ ǹtu ego, nyekwa ndị Saịdọn na ndị Taịa ihe oriri, na ihe ọṅụṅụ na mmanụ oliv, ka ha nwee ike isite nʼosimiri Lebanọn budata osisi sida ndị ahụ rute Jopa, dịka ikike Sairọs bụ eze Peshịa si kwadoo ya. 8Nʼọnwa nke abụọ nke afọ abụọ site mgbe ha bịarutere nʼụlọ Chineke na Jerusalem. Mmadụ niile ahụ lọtara Juda so rụọ ọrụ. Zerubabel nwa Shealtiel, Jeshua nwa Jozadak na ndị fọdụrụ na ụmụnne ha, bụ ndị nchụaja na ndị Livayị, na ndị niile si na ndọta nʼagha lọta Jerusalem, malitere ịrụ ọrụ ahụ. Ha họpụtara ndị Livayị niile gbara iri afọ abụọ rigoo ka ha lekọta ihe banyere ọrụ ụlọ Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.