Native Bible

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase.

Ezra 2:63 in English

Ezra 2:63 · Berean Standard Bible

The governor ordered them not to eat the most holy things until there was a priest to consult the Urim and Thummim.*

Context

61Sitekwa nʼetiti ndị nchụaja: Ndị agbụrụ Hobaya, Hakoz na Bazilai, nwoke lụrụ ada Bazilai onye Gilead, a kpọọ ya aha nʼaha ha. 62Ndị a chọrọ ebe e depụtara usoro ọmụmụ ha nʼakwụkwọ, ma ha achọtaghị ha, nʼihi ya, e wepụrụ ha nʼọrụ nchụaja dịka ndị na-adịghị ọcha. 63Onyeisi ọchịchị nyere iwu ka ha ghara iri ihe dịkarịsịrị nsọ tutu ruo mgbe e nwere onye nchụaja na-eji Urim na Tumim ajụta ase. 64Nkpọkọta ọnụọgụgụ ndị niile lọtara dị iri puku anọ na abụọ, na narị atọ, na iri isii (42,360), 65nke a agụnyeghị ndị ohu ndị ikom na ndị inyom dị puku asaa na narị atọ na iri atọ na asaa (7,337), ndị ikom na ndị inyom, ndị ọbụ abụ* dị narị abụọ (200).

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.